Aịzaya 25:8
Isaiah 25:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi. Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile site nʼihu mmadụ niile, ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile. Onyenwe anyị ekwuola ya.
Isaiah 25:8 in English
Isaiah 25:8 · Berean Standard Bible
He will swallow up death forever.* The Lord GOD will wipe away the tears from every face * and remove the disgrace of His people from the whole earth. For the LORD has spoken.
Context
6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.
Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.
Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,
nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,
nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile
site nʼihu mmadụ niile,
ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile
dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.
Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,
“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,
anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.
Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,
ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.” 10Nʼihi na aka Onyenwe anyị ga-adịgide nʼelu ugwu a,
ma a ga-azọtọ ndị Moab nʼọnọdụ ha,
dịka esi azọda ahịhịa dị nʼokpuru ụkwụ mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.