Aịzaya 25:7
Isaiah 25:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ, nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile, nke kpuchikwara ihu ndị mba niile.
Isaiah 25:7 in English
Isaiah 25:7 · Berean Standard Bible
On this mountain He will swallow up the shroud that enfolds all peoples, the sheet that covers all nations;
Context
5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.
Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,
dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,
otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị. 6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.
Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.
Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,
nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,
nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile
site nʼihu mmadụ niile,
ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile
dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.
Onyenwe anyị ekwuola ya. 9Nʼụbọchị ahụ, ndị mmadụ ga-asị,
“Nke a bụ Chineke anyị nʼezie,
anyị tụkwasịrị ya obi, ọ zọpụtakwara anyị.
Nke a bụ Onyenwe anyị ahụ, anyị tụkwasịrị ya obi,
ka anyị nwee ọṅụ ma ṅụrịakwa na nzọpụta ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.