Aịzaya 25:6
Isaiah 25:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.
Isaiah 25:6 in English
Isaiah 25:6 · Berean Standard Bible
On this mountain the LORD of Hosts will prepare a banquet for all the peoples, a feast of aged wine, of choice meat, of finely aged wine.
Context
4Nʼihi na ị bụụrụ onye na-enweghị ike ebe mgbaba;
ị bụkwaara ndị ogbenye ebe mgbaba nʼoge mkpa ha,
ebe nchebe siri ike nʼoge oke mmiri ozuzo,
na ndo nʼoge okpomọkụ.
Nʼihi na nkuume nke ndị na-adịghị emere mmadụ ebere
dị ka oke mmiri ozuzo nke na-amakwasị mgbidi, 5dịkwa ka okpomọkụ nke na-adị nʼọzara.
Ị na-eme ka mkpọtụ nke ndị mba ọzọ kwụsị,
dịka ndo nke igwe ojii na-eweta si eme ka okpomọkụ dajụọ,
otu a ka abụ ọma nke ndị na-adịghị eme ebere si kwụsị. 6Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri.
Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile.
Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị. 7Nʼelu ugwu a, ka ọ ga-ewepụ ihe ndị ahụ niile na-eweta ihu mgbarụ,
nke dị ka akwa e ji kpuchie mmadụ niile,
nke kpuchikwara ihu ndị mba niile. 8Ọ ga-elomi ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.
Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-ehicha anya mmiri niile
site nʼihu mmadụ niile,
ọ ga-ewezuga ihe ịta ụta* niile
dakwasịrị ndị ya site nʼụwa niile.
Onyenwe anyị ekwuola ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.