Aịzaya 26:9
Isaiah 26:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe.
Isaiah 26:9 in English
Isaiah 26:9 · Berean Standard Bible
My soul longs for You in the night; indeed, my spirit seeks You at dawn.* For when Your judgments come upon the earth, the people of the world learn righteousness.
Context
7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,
gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị. 8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,
na-ele anya gị.
Aha gị na ihe niile e ji mara gị
bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike. 9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,
nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,
nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe
ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe. 10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ
adịghị eme ka ha gbanwee.
Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.
Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,
ha adịghị ahụ ya.
Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.
E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.