Aịzaya 26:8
Isaiah 26:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike.
Isaiah 26:8 in English
Isaiah 26:8 · Berean Standard Bible
Yes, we wait for You, O LORD; we walk in the path of Your judgments. Your name and renown are the desire of our souls.
Context
6Ọ na-enyefe obodo ahụ
nʼaka ndị a na-emegbu emegbu,
na nʼaka ndị ogbenye ka ha zọtọọ ya ụkwụ. 7Ụzọ nke onye ezi omume ha nʼotu,
gị, Onye ziri ezi, na-eme ka okporoụzọ ndị ezi omume dị larịị. 8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile,
na-ele anya gị.
Aha gị na ihe niile e ji mara gị
bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike. 9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike,
nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike,
nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe
ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe. 10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ
adịghị eme ka ha gbanwee.
Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ.
Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.