Native Bible

Isaiah 26:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị.

Isaiah 26:10 in English

Isaiah 26:10 · Berean Standard Bible

Though grace is shown to the wicked man, he does not learn righteousness. In the land of righteousness he acts unjustly and fails to see the majesty of the LORD.

Context

8E, Onyenwe anyị, anyị na-aga nʼụzọ nke ikpe gị niile, na-ele anya gị. Aha gị na ihe niile e ji mara gị bụ ihe na-agụsị obi anyị agụ ike. 9Abalị niile ka obi m na-achọsi gị ike, nʼụtụtụ eji m mmụọ m niile na-achọsi gị ike, nʼihi na ọ bụ naanị mgbe ị bịara kpee ụwa ikpe ka mmadụ ga-esi nʼajọ omume tụgharịa ime ezi ihe. 10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha. 12Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.