Native Bible

Isaiah 26:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị.

Isaiah 26:12 in English

Isaiah 26:12 · Berean Standard Bible

O LORD, You will establish peace for us. For all that we have accomplished, You have done for us.

Context

10Obi ebere gị nʼebe ndị na-emebi iwu nọ adịghị eme ka ha gbanwee. Ọ bụladị nʼala a, ebe ndị ezi omume bi, ha na-anọgide na-eme ihe ọjọọ. Ha adịghị echeta ịdị ukwuu gị, Onyenwe anyị. 11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu, ha adịghị ahụ ya. Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha. E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha. 12Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo; nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị. 13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe. 14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.