Aịzaya 26:13
Isaiah 26:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche, ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe.
Isaiah 26:13 in English
Isaiah 26:13 · Berean Standard Bible
O LORD our God, other lords besides You have had dominion, but Your name alone do we confess.
Context
11Onyenwe anyị ebuliela aka ya elu,
ha adịghị ahụ ya.
Gosi ha ekworo gị banyere ndị gị, ka e si otu a mee ka ihere mee ha.
E, ka ọkụ ahụ ị kwadooro ndị iro gị rechapụ ha. 12Onyenwe anyị, ị na-enye anyị udo;
nʼihi na ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị. 13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,
ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe. 14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;
mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.
Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;
e chefukwaala ha. 15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;
i meela ka mba a saa mbara.
I wetarala onwe gị nsọpụrụ,
i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.