Aịzaya 26:15
Isaiah 26:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa.
Isaiah 26:15 in English
Isaiah 26:15 · Berean Standard Bible
You have enlarged the nation, O LORD; You have enlarged the nation. You have gained glory for Yourself; You have extended all the borders of the land.
Context
13O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ọ dị mgbe anyị nọ nʼokpuru ọchịchị ndị ọzọ dị iche iche,
ma ugbu a, ọ bụ naanị aha gị ka anyị na-efe. 14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;
mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.
Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;
e chefukwaala ha. 15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;
i meela ka mba a saa mbara.
I wetarala onwe gị nsọpụrụ,
i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa. 16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.
Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,
ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere. 17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,
dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.
Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.