Native Bible

Isaiah 26:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.

Isaiah 26:16 in English

Isaiah 26:16 · Berean Standard Bible

O LORD, they sought You in their distress; when You disciplined them, they poured out a quiet prayer.

Context

14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ; mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ. Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi; e chefukwaala ha. 15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị; i meela ka mba a saa mbara. I wetarala onwe gị nsọpụrụ, i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa. 16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere. 17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị. 18Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze, ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya. Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka. O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.