Aịzaya 26:16
Isaiah 26:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị. Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha, ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere.
Isaiah 26:16 in English
Isaiah 26:16 · Berean Standard Bible
O LORD, they sought You in their distress; when You disciplined them, they poured out a quiet prayer.
Context
14Ndị niile anyị fere na mbụ anwụchaala; ha adịghịkwa ndụ;
mmụọ ha agakwaghị alọghachi ọzọ.
Nʼihi na ị tara ha ahụhụ, laa ha nʼiyi;
e chefukwaala ha. 15I meela ka mba a dị ukwuu, Onyenwe anyị;
i meela ka mba a saa mbara.
I wetarala onwe gị nsọpụrụ,
i meela ka oke ala ahụ niile gbatịa. 16Onyenwe anyị, nʼime mkpagbu ha, ha gbakwutere gị.
Mgbe iwe gị bịakwasịrị ha,
ọ bụ olu dị nta ka ha ji kpeere gị ekpere. 17Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa,
dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu.
Otu a ka anyị nọ nʼihu gị. 18Anyị anọọla ọnọdụ ihe mgbu, na ịta ikikere eze,
ma o nweghị ihe ọma anyị nwetara nʼime ya.
Mgbalị anyị niile emeghị ka nzọpụta rute ụwa aka.
O nwekwaghị ihe nwere isi anyị rụpụtara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.