Aịzaya 26:3
Isaiah 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike nwee udo zuruoke, nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha.
Isaiah 26:3 in English
Isaiah 26:3 · Berean Standard Bible
You will keep in perfect peace the steadfast of mind, because he trusts in You.
Context
1Nʼụbọchị ahụ, a ga-abụ abụ a nʼala Juda niile:
Anyị nwere obodo e wusiri ike.
Chineke na-eme ka mgbidi ya
na ebe ya niile e wusiri ike bụrụ nzọpụta nye anyị. 2Meghee ụzọ ama niile,
ka mba ndị ahụ na-eme ezi omume bata,
e, bụ mba ahụ kwesiri ntụkwasị obi. 3Ị na-eme ka ndị niile echiche uche ha guzosiri ike
nwee udo zuruoke,
nʼihi na ọ bụ na gị ka ha na-atụkwasị obi ha. 4Tụkwasị Onyenwe anyị Chineke obi mgbe niile,
nʼihi na Onyenwe anyị Chineke bụ oke nkume nke mgbe ebighị ebi. 5Ndị na-akpa nganga ka ọ na-ewedata ala,
na-emekwa ka obodo na-anya isi kpọọ ọnụ nʼala.
Mgbidi ya
ka ọ na-eme ka ọ daruo ala.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.