Native Bible

Psalms 136 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 136
1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 20Na Ọg eze Bashan, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 21Were ala ha nye dịka ihe nketa, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri, Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele. Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.