Abụ Ọma 136
Psalms 136 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 2Keleenụ Chineke kachasị chi niile elu.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 3Keleenụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ niile.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 4Keleenụ onye ahụ naanị ya na-arụ ọrụ ebube dị iche iche,
ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 5Keleenụ onye ahụ ji nghọta ya kee mbara eluigwe niile,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 6Keleenụ onye wuru ụwa nʼelu ogbu mmiri,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 7Keleenụ onye ahụ kere anyanwụ na ọnwa,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 8Onye mere anyanwụ ka ọ na-acha nʼehihie,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 9Onye mere ka ọnwa na kpakpando na-achị nʼabalị,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 10Onye ahụ tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼIjipt,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 11O duuru ndị Izrel site nʼIjipt pụta,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 12O ji aka ya dị ike nke o setịpụrụ esetipụ dupụta ha;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 13Onye ahụ kewara Osimiri Uhie abụọ,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 14Onye duuru ndị Izrel gafee nʼetiti ya,
nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 15Ma Osimiri Uhie riri Fero na ndị agha ya niile;
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 16Keleenụ onye duuru ndị ya gafee ọzara,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 17Onye ahụ tigburu ndị eze dị ukwuu,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 18O gbukwara ndị eze dị ike nke ukwuu,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 19O gburu Saịhọn eze ndị Amọrait,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 20Na Ọg eze Bashan,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 21Were ala ha nye dịka ihe nketa,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 22O nyere ohu ya Izrel ala ahụ ka ọ bụrụ ihe nketa ha,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 23Onye chetara anyị mgbe anyị na-adịghị ike,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 24Mee ka anyị nwere onwe anyị site nʼaka ndị iro anyị,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 25Ọ na-enye ihe niile dị ndụ nri,
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. 26Keleenụ Chineke nke eluigwe ekele.
Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.