Abụ Ọma 116
Psalms 116 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Ahụrụ m Onyenwe anyị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m;
ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. 2Nʼihi na o gere m ntị,
aga m akpọku ya oge ndụ m niile. 3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m,
oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m;
nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. 4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị:
“O Onyenwe anyị, zọpụta m!” 5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume.
Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. 6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche;
mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. 7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m,
nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma. 8Nʼihi na gị, o Onyenwe anyị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ,
anya m site na anya mmiri akwa,
napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, 9ka m nwee ike jegharịa nʼihu Onyenwe anyị
nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi. 10Ekwenyere m na Onyenwe anyị mgbe m kwuru sị,
“Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” 11nʼime ịda mba m, ekwuru m sị,
“Mmadụ niile bụ ndị ụgha.” 12Gịnị ka m ga-enyeghachi Onyenwe anyị
nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? 13Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 14Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ
mezuo nkwa m kwere Onyenwe anyị. 15Ọnwụ nke ndị nsọ ya
dị oke ọnụahịa nʼanya Onyenwe anyị. 16O Onyenwe anyị, nʼezie, abụ m ohu gị;
abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị;
ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. 17Aga m achụrụ gị aja ekele
kpọkuokwa aha Onyenwe anyị. 18Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile
ka m ga-anọ kwụghachi Onyenwe anyị nkwa m kwere, 19nʼime ogige ụlọ Onyenwe anyị,
nʼetiti gị, O Jerusalem.
Toonu Onyenwe anyị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.