Native Bible

Psalms 116:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko.

Psalms 116:5 in English

Psalms 116:5 · Berean Standard Bible

The LORD is gracious and righteous; our God is full of compassion.

Context

3Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. 4Mgbe ahụ, akpọkuru m aha Onyenwe anyị: “O Onyenwe anyị, zọpụta m!” 5Onyenwe anyị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. 6Onyenwe anyị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. 7Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na Onyenwe anyị emesola gị mmeso ọma.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.