Native Bible

Isaiah 21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Aịzaya 21
1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu. 2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị. 3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu* zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya. 4Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji. 5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ! 6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ. 7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.” 8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile. 9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ” 10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru. 11Nke a bụ amụma megide Duma: Otu onye si na Sia na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?” 12Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.” 13Amụma megide Arebịa: Unu ndị ije niile nke Dedan, ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa, 14kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ; unu ndị bi nʼala Tema, buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri. 15Nʼihi na ọ bụ site nʼagha nke e ji mma agha egbu ndị mmadụ, na agha e ji akụ agbatu mmadụ ka ha si na-agbapụ ọsọ. 16Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị. 17Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya. 21:3 Ya bụ, ahụ ụfụ

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.