Aịzaya 21:10
Isaiah 21:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka, agwala m unu ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ Chineke Izrel kwuru.
Isaiah 21:10 in English
Isaiah 21:10 · Berean Standard Bible
O my people, crushed on the threshing floor, I tell you what I have heard from the LORD of Hosts, the God of Israel.
Context
8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,
“Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,
nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile. 9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,
ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.
O nyeghachiri ọsịsa ahụ,
‘Babilọn adaala, e ọ daala,
arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile
a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ” 10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,
agwala m unu ihe
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
bụ Chineke Izrel kwuru. 11Nke a bụ amụma megide Duma:
Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,
“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?
Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?” 12Onye nche zara sị,
“Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,
ma laghachikwa ọzọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.