Aịzaya 21:9
Isaiah 21:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”
Isaiah 21:9 in English
Isaiah 21:9 · Berean Standard Bible
Look, here come the riders, horsemen in pairs.” And one answered, saying: “Fallen, fallen is Babylon!* All the images of her gods lie shattered on the ground!”
Context
7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,
na usuu ịnyịnya,
na ndị na-agba ịnyịnya ibu,
maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,
gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,
nọọkwa na njikere.” 8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,
“Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,
nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile. 9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,
ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.
O nyeghachiri ọsịsa ahụ,
‘Babilọn adaala, e ọ daala,
arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile
a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ” 10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,
agwala m unu ihe
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
bụ Chineke Izrel kwuru. 11Nke a bụ amụma megide Duma:
Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,
“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?
Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.