Aịzaya 21:11
Isaiah 21:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ amụma megide Duma: Otu onye si na Sia na-akpọ m oku, “Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ? Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”
Isaiah 21:11 in English
Isaiah 21:11 · Berean Standard Bible
This is the burden against Dumah:* One calls to me from Seir,* “Watchman, what is left of the night? Watchman, what is left of the night?”
Context
9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,
ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.
O nyeghachiri ọsịsa ahụ,
‘Babilọn adaala, e ọ daala,
arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile
a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ” 10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,
agwala m unu ihe
Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
bụ Chineke Izrel kwuru. 11Nke a bụ amụma megide Duma:
Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,
“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?
Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?” 12Onye nche zara sị,
“Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,
ma laghachikwa ọzọ.” 13Amụma megide Arebịa:
Unu ndị ije niile nke Dedan,
ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.