Native Bible

Isaiah 21:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.”

Isaiah 21:7 in English

Isaiah 21:7 · Berean Standard Bible

When he sees chariots with teams of horsemen, riders on donkeys, riders on camels, he must be alert, fully alert.”

Context

5Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ! 6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m, “Gaa, guzobe onye nche, ka o kwuo ihe ọ na-ahụ. 7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha, na usuu ịnyịnya, na ndị na-agba ịnyịnya ibu, maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ, gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma, nọọkwa na njikere.” 8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị, “Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche, nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile. 9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa, ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ. O nyeghachiri ọsịsa ahụ, ‘Babilọn adaala, e ọ daala, arụsị niile apịrị apị nke chi ya niile a kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.