Aịzaya 21:5
Isaiah 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha na-akwado tebul. Ha na-edozi ute ịnọdụ ala, ha na-eri, ha na-aṅụ. Bilienụ ndịisi agha, teekwanụ ọta niile mmanụ!
Isaiah 21:5 in English
Isaiah 21:5 · Berean Standard Bible
They prepare a table, they lay out a carpet, they eat, they drink! Rise up, O princes, oil the shields!
Context
3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,
oke ihe mgbu* zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.
Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,
ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya. 4Obi m anọkwaghị jụụ,
oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;
chi ojiji nke m na-ele anya ya
aghọọlara m ihe ịma jijiji. 5Ha na-akwado tebul.
Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,
ha na-eri, ha na-aṅụ.
Bilienụ ndịisi agha,
teekwanụ ọta niile mmanụ! 6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,
“Gaa, guzobe onye nche,
ka o kwuo ihe ọ na-ahụ. 7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,
na usuu ịnyịnya,
na ndị na-agba ịnyịnya ibu,
maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,
gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,
nọọkwa na njikere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.