Aịzaya 21:4
Isaiah 21:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Obi m anọkwaghị jụụ, oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu; chi ojiji nke m na-ele anya ya aghọọlara m ihe ịma jijiji.
Isaiah 21:4 in English
Isaiah 21:4 · Berean Standard Bible
My heart falters; fear makes me tremble. The twilight of my desire has turned to horror.
Context
2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi,
na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo.
Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu!
Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị. 3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,
oke ihe mgbu* zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.
Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,
ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya. 4Obi m anọkwaghị jụụ,
oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;
chi ojiji nke m na-ele anya ya
aghọọlara m ihe ịma jijiji. 5Ha na-akwado tebul.
Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,
ha na-eri, ha na-aṅụ.
Bilienụ ndịisi agha,
teekwanụ ọta niile mmanụ! 6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,
“Gaa, guzobe onye nche,
ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.