Native Bible

Isaiah 21:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu.

Isaiah 21:1 in English

Isaiah 21:1 · Berean Standard Bible

This is the burden against the Desert by the Sea: Like whirlwinds sweeping through the Negev, an invader comes from the desert, from a land of terror.

Context

1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu. 2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi, na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo. Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu! Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị. 3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu, oke ihe mgbu* zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme. Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ, ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.