Aịzaya 19
Isaiah 19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nke a bụ amụma megide Ijipt:
Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt,
ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.
Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.
Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha. 2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.
Nwanne ga-emegide nwanne ya,
onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;
obodo ga-emegide isi obodo;
otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze. 3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,
aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,
ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,
jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa. 4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,
Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,*
nke na-adịghị eme ebere,
ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.” 5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;
ọ ga-atakwa takọrọkwa. 6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
ga-atalata bido nʼisi isi.
Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa. 7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
ifufe ga-efesakwa ha.
Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,
ihe niile ga-anwụ. 8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,
ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri
ga-ata ahụ. 9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ. 10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ. 11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.
Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,
“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,
onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”? 12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,
ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
zubere megide Ijipt. 13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
ndịisi obodo Memfis* aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;
ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile
eduhiela ndị Ijipt ụzọ. 14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;
nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme
dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ. 15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara. 16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha. 18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ. 19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt.* A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya. 22Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha. 23Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe. 24Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa. 25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”
19:4 Eze Shabaka, onye Kush chịrị ala Ijipt na senchuri nke asaa. Aịz 20:4; Jer 46:26; Izk 29:19
19:13 Memfis bụ isi obodo ndị Ijipt nʼoge ochie. Izk 30:13; Hos 9:6
19:19 Jen 28:18; Ọpụ 24:4; Jos 22:10,26,27
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.