Native Bible

Isaiah 19:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.

Isaiah 19:10 in English

Isaiah 19:10 · Berean Standard Bible

The workers in cloth * will be dejected, and all the hired workers will be sick at heart.

Context

8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ. 9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ. 10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego, ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ. 11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ, ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye. Ị ga-esi aṅaa gwa Fero, “Abụ m otu nʼime ndị maara ihe, onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”? 12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.