Aịzaya 19:12
Isaiah 19:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a? Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara, ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile zubere megide Ijipt.
Isaiah 19:12 in English
Isaiah 19:12 · Berean Standard Bible
Where are your wise men now? Let them tell you and reveal what the LORD of Hosts has planned against Egypt.
Context
10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ. 11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.
Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,
“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,
onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”? 12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,
ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
zubere megide Ijipt. 13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
ndịisi obodo Memfis* aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;
ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile
eduhiela ndị Ijipt ụzọ. 14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;
nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme
dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.