Aịzaya 19:14
Isaiah 19:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke; nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.
Isaiah 19:14 in English
Isaiah 19:14 · Berean Standard Bible
The LORD has poured into her a spirit of confusion. Egypt has been led astray in all she does, as a drunkard staggers through his own vomit.
Context
12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?
Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,
ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
zubere megide Ijipt. 13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
ndịisi obodo Memfis* aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;
ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile
eduhiela ndị Ijipt ụzọ. 14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;
nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme
dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ. 15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara. 16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.