Aịzaya 19:15
Isaiah 19:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime, isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.
Isaiah 19:15 in English
Isaiah 19:15 · Berean Standard Bible
There is nothing Egypt can do— head or tail, palm or reed.
Context
13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,
ndịisi obodo Memfis* aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;
ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niile
eduhiela ndị Ijipt ụzọ. 14Onyenwe anyị awụnyela nʼime ha
mmụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;
nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-eme
dịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ. 15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,
isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara. 16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha. 17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.