Aịzaya 19:8
Isaiah 19:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa, na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl, ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri ga-ata ahụ.
Isaiah 19:8 in English
Isaiah 19:8 · Berean Standard Bible
Then the fishermen will mourn, all who cast a hook into the Nile will lament, and those who spread nets on the waters will pine away.
Context
6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
ga-atalata bido nʼisi isi.
Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa. 7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
ifufe ga-efesakwa ha.
Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,
ihe niile ga-anwụ. 8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,
ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri
ga-ata ahụ. 9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ. 10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.