Aịzaya 19:6
Isaiah 19:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.
Isaiah 19:6 in English
Isaiah 19:6 · Berean Standard Bible
The canals will stink; the streams of Egypt will trickle and dry up; the reeds and rushes will wither.
Context
4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,
Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,*
nke na-adịghị eme ebere,
ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.” 5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;
ọ ga-atakwa takọrọkwa. 6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị
ga-atalata bido nʼisi isi.
Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa. 7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
ifufe ga-efesakwa ha.
Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,
ihe niile ga-anwụ. 8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,
ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri
ga-ata ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.