Native Bible

Isaiah 19:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa.

Isaiah 19:5 in English

Isaiah 19:5 · Berean Standard Bible

The waters of the Nile will dry up, and the riverbed will be parched and empty.

Context

3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha, aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu, ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase, jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa. 4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị, Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,* nke na-adịghị eme ebere, ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.” 5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada; ọ ga-atakwa takọrọkwa. 6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharị ga-atalata bido nʼisi isi. Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa. 7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ, ifufe ga-efesakwa ha. Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi, ihe niile ga-anwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.