Aịzaya 19:9
Isaiah 19:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ, na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.
Isaiah 19:9 in English
Isaiah 19:9 · Berean Standard Bible
The workers in flax will be dismayed, and the weavers of fine linen will turn pale.
Context
7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,
ifufe ga-efesakwa ha.
Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,
ihe niile ga-anwụ. 8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,
na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,
ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiri
ga-ata ahụ. 9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,
na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ. 10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,
ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ. 11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,
ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.
Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,
“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,
onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.