Aịzaya 19:20
Isaiah 19:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.
Isaiah 19:20 in English
Isaiah 19:20 · Berean Standard Bible
It will be a sign and a witness to the LORD of Hosts in the land of Egypt. When they cry out to the LORD because of their oppressors, He will send them a savior and defender to rescue them.
Context
18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ. 19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt.* A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha. 20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha. 21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya. 22Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.