Amos 1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị. 2Ọ sịrị,
Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ,
o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda.
Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ.
Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa. 3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,
na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,
ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;
ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad. 5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,
aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,
na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.
Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”
Ka Onyenwe anyị kwuru. 6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,
e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,
ranye nʼaka ndị Edọm. 7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza,
ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ. 8Aga m egbu ndị Ashdọd,
ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn.
Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn,
ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị. 9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,
ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha. 10Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa;
ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.” 11Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Edọm,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ,
o meghị ebere,
kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike;
nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị. 12Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman;
ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.” 13Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Amọn,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime,
nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara. 14Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba.
Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike.
Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe,
na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ. 15Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha,
ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.”
Ka Onyenwe anyị sịrị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.