Emọs 1:11
Amos 1:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.
Amos 1:11 in English
Amos 1:11 · Berean Standard Bible
This is what the LORD says: “For three transgressions of Edom, even four, I will not revoke My judgment, because he pursued his brother with the sword and stifled all compassion; his anger raged continually, and his fury flamed incessantly.
Context
9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,
ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha. 10Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa;
ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.” 11Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Edọm,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ,
o meghị ebere,
kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike;
nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị. 12Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman;
ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.” 13Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Amọn,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime,
nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.