Native Bible

Amos 1:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.

Amos 1:13 in English

Amos 1:13 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “For three transgressions of the Ammonites, even four, I will not revoke My judgment, because they ripped open the pregnant women of Gilead in order to enlarge their territory.

Context

11Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị. 12Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman; ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.” 13Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Amọn, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime, nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara. 14Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba. Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike. Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe, na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ. 15Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha, ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.” Ka Onyenwe anyị sịrị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.