Emọs 1:10
Amos 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”
Amos 1:10 in English
Amos 1:10 · Berean Standard Bible
So I will send fire upon the walls of Tyre to consume its citadels.”
Context
8Aga m egbu ndị Ashdọd,
ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn.
Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn,
ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị. 9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,
ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha. 10Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa;
ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.” 11Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Edọm,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ,
o meghị ebere,
kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike;
nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị. 12Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman;
ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.