Native Bible

Amos 1:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.

Amos 1:9 in English

Amos 1:9 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “For three transgressions of Tyre, even four, I will not revoke My judgment, because they delivered up a whole congregation of exiles to Edom and broke a covenant of brotherhood.

Context

7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ. 8Aga m egbu ndị Ashdọd, ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn. Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn, ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.” Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị. 9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Taịa, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu, ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha. 10Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa; ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.” 11Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Edọm, e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ, o meghị ebere, kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike; nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.