Emọs 1:7
Amos 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
Amos 1:7 in English
Amos 1:7 · Berean Standard Bible
So I will send fire upon the walls of Gaza, to consume its citadels.
Context
5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,
aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,
na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.
Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”
Ka Onyenwe anyị kwuru. 6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,
e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,
ranye nʼaka ndị Edọm. 7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza,
ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ. 8Aga m egbu ndị Ashdọd,
ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn.
Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn,
ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.”
Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị. 9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,
e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,
ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.