Native Bible

Amos 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

Amos 1:5 in English

Amos 1:5 · Berean Standard Bible

I will break down the gates of Damascus; I will cut off the ruler * of the Valley of Aven * and the one who wields the scepter in Beth-eden. The people of Aram will be exiled to Kir,” says the LORD.

Context

3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad. 5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru. 6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Gaza, e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ, nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha, ranye nʼaka ndị Edọm. 7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza, ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.