Emọs 1:5
Amos 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.
Amos 1:5 in English
Amos 1:5 · Berean Standard Bible
I will break down the gates of Damascus; I will cut off the ruler * of the Valley of Aven * and the one who wields the scepter in Beth-eden. The people of Aram will be exiled to Kir,” says the LORD.
Context
3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,
na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,
ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;
ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad. 5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,
aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,
na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.
Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”
Ka Onyenwe anyị kwuru. 6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,
e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,
ranye nʼaka ndị Edọm. 7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza,
ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.