Emọs 1:4
Amos 1:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
Amos 1:4 in English
Amos 1:4 · Berean Standard Bible
So I will send fire upon the house of Hazael to consume the citadels of Ben-hadad.
Context
2Ọ sịrị,
Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ,
o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda.
Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ.
Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa. 3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,
na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,
ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;
ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad. 5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,
aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,
na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.
Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”
Ka Onyenwe anyị kwuru. 6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,
e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,
nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,
ranye nʼaka ndị Edọm.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.