Emọs 1:2
Amos 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.
Amos 1:2 in English
Amos 1:2 · Berean Standard Bible
He said: “The LORD roars from Zion and raises His voice from Jerusalem; the pastures of the shepherds mourn, and the summit of Carmel withers.”
Context
1Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị. 2Ọ sịrị,
Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ,
o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda.
Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ.
Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa. 3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,
“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,
na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.
Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,
ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;
ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.