Native Bible

Amos 1:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.

Amos 1:3 in English

Amos 1:3 · Berean Standard Bible

This is what the LORD says: “For three transgressions of Damascus, even four, I will not revoke My judgment,* because they threshed Gilead with sledges of iron.

Context

1Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị. 2Ọ sịrị, Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ, o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda. Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ. Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa. 3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs, na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ. Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead, ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze. 4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael; ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad. 5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs, aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven, na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden. Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.” Ka Onyenwe anyị kwuru.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.