Native Bible

Song of Songs 4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ nke Abụ 4
1Leenụ ka i si maa mma, onye m hụrụ nʼanya, e, ị mara mma!* Anya gị abụọ nke dị nʼazụ akwa mkpuchi ihu gị dị ka nduru. Agịrị isi gị dị ka igwe ewu* nke na-arịda nʼakụkụ ugwu Gilead. 2Eze gị dị ka igwe atụrụ a ka kpachapụrụ ajị ha ọhụrụ, nke si nʼebe a sapụrụ ha ahụ na-arịpụta. Nke ọbụla chi ụmụ abụọ, ọ dịghịkwa nke gba aka nwa nʼetiti ha. 3Egbugbere ọnụ gị abụọ dị ka ogho uhie. Ọnụ gị dị mma ile anya. Agba nti gị abụọ nke dị nʼime akwa mkpuchi gị dị ka pomegranet* e kere abụọ. 4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid, nke e wuziri nke ọma. E konyere puku ọta na ya, ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.* 5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi. 6Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi. 7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ. 8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi. 9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m. 10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla. 11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn 12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.* 13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad, 14naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ. 15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.* 16Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;* bịakwa gị ifufe si na ndịda, fekwasị ubi m a gbara ogige, ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile, ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige, ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa. 4:1 Abk 1:15; 5:12 4:1 Igwe ewu ndị a dị ojii. 4:3 Pomegranet na-acha uhie uhie. 4:4 Neh 3:19 4:7 Efe 5:27 4:12 I ji debe olulu mmiri ọcha, ka ọ ghara ịgwọtọ, a na-emere ya okwuchi. Ma ọ bụrụ isi iyi, a na-akpa ihe mgbochi ka ndị mmadụ ghara iru nʼebe elu elu ya mgbe ha na-ekute mmiri. 4:15 Mgbe mkpụrụ mmiri nke kpuchiri ugwu Lebanọn na-agbaze, mmiri ya na-asọdata sọbanye nʼime ọtụtụ isi iyi, mee ka isi iyi ndị ahụ ghara ịta ata. 4:16 Ọ bụ ifufe na-esite na mpaghara ugwu, nke na-efe nwayọọ na-eme ka mkpụrụ dị ọhụrụ, maa mma. Ma nke na-esite na ndịda, na-ebute okpomọkụ na-eme ka mkpụrụ ndị a chaa nke ọma. Ikuku abụọ ndị a bụ ihe na-ekusasi ezi isisi nke okoko ahịhịa dị nʼubi a gbara ogige.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.