Abụ nke Abụ 4:11
Song of Songs 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn
Song of Songs 4:11 in English
Song of Songs 4:11 · Berean Standard Bible
Your lips, my bride, drip sweetness like the honeycomb; honey and milk are under your tongue, and the fragrance of your garments is like the aroma of Lebanon.
Context
9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m. 10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya,
isisi ụtọ nke mmanụ otite gị
na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla. 11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m,
mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị,
isisi ụtọ nke uwe gị
na-esi ka Lebanọn 12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.
Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.* 13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet
nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa,
nke nwere henna na naad,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.