Native Bible

Song of Songs 4:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.

Song of Songs 4:10 in English

Song of Songs 4:10 · Berean Standard Bible

How delightful is your love, my sister, my bride! Your love is much better than wine, and the fragrance of your perfume than all spices.

Context

8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi. 9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m. 10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m. Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya, isisi ụtọ nke mmanụ otite gị na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla. 11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn 12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.