Abụ nke Abụ 4:8
Song of Songs 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi.
Song of Songs 4:8 in English
Song of Songs 4:8 · Berean Standard Bible
Come with me from Lebanon, my bride, come with me from Lebanon! Descend * from the peak of Amana, from the summits of Senir and Hermon, from the dens of the lions, from the mountains of the leopards.
Context
6Tutu chi ụtụtụ abọọ,
tutu onyinyo agbalaga,
aga m aga nʼugwu ụda máá
na nʼugwu insensi. 7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ. 8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
Si na Lebanọn bịa soro m;
rịdata site nʼugwu Amana,
nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,
site nʼọgba ọdụm
nʼugwu niile ebe agụ bi. 9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m. 10Lee ka ịhụnanya gị si dị ụtọ, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m.
Lee ka ịhụnanya gị si dị mma nke ukwuu karịa mmanya,
isisi ụtọ nke mmanụ otite gị
na-esi isi ọma karịa mmanụ ụda ọbụla.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.