Abụ nke Abụ 4:6
Song of Songs 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi.
Song of Songs 4:6 in English
Song of Songs 4:6 · Berean Standard Bible
Before the day breaks and the shadows flee, I will make my way to the mountain of myrrh and to the hill of frankincense.
Context
4Olu gị dị ka ụlọ elu Devid,
nke e wuziri nke ọma.
E konyere puku ọta na ya,
ha niile bụ ọta nke ndị ọka nʼagha.* 5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,
nke otu nne mụrụ nʼotu oge,
ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi. 6Tutu chi ụtụtụ abọọ,
tutu onyinyo agbalaga,
aga m aga nʼugwu ụda máá
na nʼugwu insensi. 7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ. 8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
Si na Lebanọn bịa soro m;
rịdata site nʼugwu Amana,
nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,
site nʼọgba ọdụm
nʼugwu niile ebe agụ bi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.