Abụ nke Abụ 4:7
Song of Songs 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ.
Song of Songs 4:7 in English
Song of Songs 4:7 · Berean Standard Bible
You are altogether beautiful, my darling; in you there is no flaw.
Context
5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ,
nke otu nne mụrụ nʼotu oge,
ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi. 6Tutu chi ụtụtụ abọọ,
tutu onyinyo agbalaga,
aga m aga nʼugwu ụda máá
na nʼugwu insensi. 7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya,
ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ. 8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ.
Si na Lebanọn bịa soro m;
rịdata site nʼugwu Amana,
nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon,
site nʼọgba ọdụm
nʼugwu niile ebe agụ bi. 9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m;
i riela m obi,
i werela ile anya gị
na ihe olu i yi rie obi m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.