Native Bible

Song of Songs 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ.

Song of Songs 4:7 in English

Song of Songs 4:7 · Berean Standard Bible

You are altogether beautiful, my darling; in you there is no flaw.

Context

5Ara gị abụọ dị ka ụmụ mgbada abụọ, nke otu nne mụrụ nʼotu oge, ndị na-ata nri nʼetiti okoko urodi. 6Tutu chi ụtụtụ abọọ, tutu onyinyo agbalaga, aga m aga nʼugwu ụda máá na nʼugwu insensi. 7Ị mara mma nke ukwuu, onye m hụrụ nʼanya, ọ dịkwaghị ntụpọ* ọbụla dị gị nʼahụ. 8Si na Lebanọn soro m, nwunye m lụrụ ọhụrụ. Si na Lebanọn bịa soro m; rịdata site nʼugwu Amana, nʼugwu Senia, na nʼugwu Hemon, site nʼọgba ọdụm nʼugwu niile ebe agụ bi. 9I riela m obi, nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ m; i riela m obi, i werela ile anya gị na ihe olu i yi rie obi m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.