Native Bible

Song of Songs 4:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad,

Song of Songs 4:13 in English

Song of Songs 4:13 · Berean Standard Bible

Your branches are an orchard of pomegranates with the choicest of fruits, with henna and nard,

Context

11Egbugbere ọnụ gị dị ụtọ dịka mmanụ aṅụ dị, nwunye ọhụrụ m, mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ dị nʼokpuru ire gị, isisi ụtọ nke uwe gị na-esi ka Lebanọn 12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ. Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.* 13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa, nke nwere henna na naad, 14naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ. 15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige, olulu mmiri dị ndụ nke si na Lebanọn asọdata.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.