Abụ nke Abụ 4:14
Song of Songs 4:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
naad na safron, kalamus na sinamọn, na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na ụda máá, na aloos na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ.
Song of Songs 4:14 in English
Song of Songs 4:14 · Berean Standard Bible
with nard and saffron, with calamus and cinnamon, with every kind of frankincense tree, with myrrh and aloes, with all the finest spices.
Context
12Ubi a gbara ogige, ma gbachiekwa, ka nwanne m nwanyị, nwunye ọhụrụ bụ.
Ị bụ isi iyi nke a gbara ogige, rachiekwa.* 13Ihe ọkụkọ dị nʼime ogige gị bụ pomegranet
nwere ezi mkpụrụ dị oke ọnụahịa,
nke nwere henna na naad, 14naad na safron,
kalamus na sinamọn,
na osisi nke ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ,
na ụda máá, na aloos
na ụda kachasị mma dị iche iche na-esi isi ụtọ. 15I bụ isi iyi nke ubi a gbara ogige,
olulu mmiri dị ndụ
nke si na Lebanọn asọdata.* 16Teta nʼụra gị ifufe si nʼugwu;*
bịakwa gị ifufe si na ndịda,
fekwasị ubi m a gbara ogige,
ka isisi ụda ya dị ụtọ fesaa ebe niile,
ka onye m hụrụ nʼanya bịa nʼubi ya a gbara ogige,
ka ọ bịa rie mkpụrụ dị iche iche dị nʼime ya nke dị oke ọnụahịa.
4:1 Abk 1:15; 5:12
4:1 Igwe ewu ndị a dị ojii.
4:3 Pomegranet na-acha uhie uhie.
4:4 Neh 3:19
4:7 Efe 5:27
4:12 I ji debe olulu mmiri ọcha, ka ọ ghara ịgwọtọ, a na-emere ya okwuchi. Ma ọ bụrụ isi iyi, a na-akpa ihe mgbochi ka ndị mmadụ ghara iru nʼebe elu elu ya mgbe ha na-ekute mmiri.
4:15 Mgbe mkpụrụ mmiri nke kpuchiri ugwu Lebanọn na-agbaze, mmiri ya na-asọdata sọbanye nʼime ọtụtụ isi iyi, mee ka isi iyi ndị ahụ ghara ịta ata.
4:16 Ọ bụ ifufe na-esite na mpaghara ugwu, nke na-efe nwayọọ na-eme ka mkpụrụ dị ọhụrụ, maa mma. Ma nke na-esite na ndịda, na-ebute okpomọkụ na-eme ka mkpụrụ ndị a chaa nke ọma. Ikuku abụọ ndị a bụ ihe na-ekusasi ezi isisi nke okoko ahịhịa dị nʼubi a gbara ogige.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.